6 Jehova wee gwa m n’ụbọchị Josaya bụ́ eze, sị:+ “‘Ị̀ hụwo ihe Izrel na-ekwesịghị ntụkwasị obi mere?+ Ọ na-agbago n’ugwu ọ bụla dị elu,+ na-agakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ,+ ka o wee gbaa akwụna n’ebe ahụ.+
5 Gịnị mere ndị a, bụ́ ndị Jeruselem, ji bụrụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi, ndị ekwesịghị ntụkwasị obi ha na-enweghị nkwụsị? Ha ejidesiwo aghụghọ aka ike;+ ha ajụwo ịlọghachi.+