15 Ha wee kpuchie elu ala ahụ dum,+ ọchịchịrị wee gbaa n’ala ahụ;+ ha wee richapụ ahịhịa ndụ niile dị n’ala ahụ na mkpụrụ niile dị n’osisi bụ́ ndị akụ́ mmiri ígwé ahụ na-emebighị;+ ọ dịghịkwa ihe ọ bụla na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ fọdụrụ n’elu osisi ma ọ bụ n’ahịhịa dị n’ọhịa n’ala Ijipt dum.+
9 “‘Emere m ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ, meekwa ka ihe unu kụrụ maa ebu.+ Unu mere ka ubi vaịn unu na ubi unu ndị ọzọ dị ọtụtụ, ma egú ripịara osisi fig unu na osisi oliv unu;+ ma unu alọghachikwuteghị m,’+ ka Jehova kwuru.