11 “Olee uru ọtụtụ àjà unu na-achụ baara m?” ka Jehova kwuru. “Àjà ebule+ a na-esurecha n’ọkụ+ nakwa abụba nke anụ mara abụba+ agbụla m; ọbara+ nwa oké ehi na nke nwa ebule na nke mkpi+ adịghịkwa atọ m ụtọ.+
20 “Olee nke gbasara m na unu na-eweta ọbụna frankinsens nke si Shiba,+ na-ewetakwa ahịhịa na-esi ísì ụtọ nke si n’ala dị anya? Àjà unu nke a na-esurecha n’ọkụ adịghị enye m obi ụtọ,+ àjà nkịtị unu na-achụ adịghịkwa atọ m ụtọ.”+