11 “Nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘N’ihi nnupụisi atọ nke Idọm nupụrụ+ nakwa n’ihi nnupụisi anọ o nupụrụ, m gaghị eme ka ọ laghachi azụ, n’ihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ+ nakwa n’ihi na o meghịrị ya ebere,+ o ji iwe ya na-adọri anụ ruo mgbe ebighị ebi; o bukwa ọnụma n’obi ruo mgbe niile.+