7Ụmụ Izrel wee mee omume ekwesịghị ntụkwasị obi n’ihe banyere ihe a ga-ebibi ebibi, n’ihi na Ekan+ nwa Kamaị, nwa Zabdaị, nwa Zira, nke ebo Juda, weere ụfọdụ n’ime ihe a ga-ebibi ebibi.+ Jehova wee weso ụmụ Izrel iwe dị ọkụ.+
23 Neaman wee sị: “Ngwanụ, were talent abụọ.” O wee na-arịọsi ya ike,+ mesịa kechie talent ọlaọcha abụọ n’akpa abụọ, tinyere uwe mgbanwe abụọ, wee bunye ha mmadụ abụọ n’ime ndị na-ejere ya ozi, ka ha wee buru ha na-aga n’ihu ya.
3 Ọlaedo na ọlaọcha unu atawo nchara, ịta nchara ha ga-abụkwa ihe àmà megide unu, ọ ga-erikwa anụ unu. Ọ bụ ihe dị ka ọkụ+ ka unu kwakọbaworo+ n’oge ikpeazụ.+