6 Eze Izrel wee kpọkọta+ ndị amụma, ihe dị ka narị ndị ikom anọ, wee sị ha: “Ọ̀ bụ m gaa buso Remọt-gilied agha, ka ọ̀ bụ mụ agala?” Ha wee na-asị: “Gawa,+ Jehova ga-enyefekwa ya n’aka eze.”
4Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwerela okwu dum si n’aka mmụọ,+ kama nwaleenụ okwu si n’aka mmụọ, ka unu wee chọpụta ma ò si n’aka Chineke,+ n’ihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha abanyewo n’ime ụwa.+