8 Ọ̀ bụ na ndị Itiopia+ na ndị Libia+ abụghị ìgwè ndị agha dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya?+ Ọ̀ bụ na Jehova enyefeghị ha n’aka gị maka na ị dabeere n’ebe ọ nọ?+
9 Gbagoonụ, unu ịnyịnya; gbawanụ ara ara, unu ụgbọ ịnyịnya! Ka ndị dike, bụ́ Kush+ na Pọt+ gaa, bụ́ ndị na-ebu ọta, tinyere ndị Ludim,+ bụ́ ndị na-ekwe ụta ma na-agba ụta ya.
10 Ndị Peshia+ na ndị Ludim+ na ndị Pọt+—ha so n’ìgwè ndị agha gị, ndị na-alụrụ gị agha. Ha kokwasịrị ọta na okpu agha ha ná mgbidi gị.+ Ọ bụ ha mere ka ị maa mma.