18 Ugwu Saịnaị dum wee na-akwụ anwụrụ ọkụ,+ n’ihi na Jehova ji ọkụ gbadata na ya;+ anwụrụ ọkụ si na ya wee na-akwụgo dị ka anwụrụ ọkụ si n’ekwú ọkụ,+ ugwu ahụ dum nọkwa na-ama jijiji nke ukwuu.+
14 Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha,+ ọ ga-agbapụkwa ụta ya dị ka àmụ̀mà.+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi,+ ọ ga-esoro ifufe nke ebe ndịda gaa.+