13 Jehova wee sị: “Ebe ọ bụ na ọ bụ n’ọnụ ka ndị a bịakwuteworo m, ọ bụkwa naanị egbugbere ọnụ ha ka ha ji nye m otuto,+ ha emewo ka obi ha dị anya n’ebe m nọ,+ egwu ha na-atụ m bụkwa ihe mmadụ nyere n’iwu nke a na-akụziri ha,+
22 ka anyị jiri ezi obi na-abịaru nso, nwee obi ike zuru ezu na okwukwe, ebe e fesaworo mmiri dị ọcha n’obi anyị ka ọ ghara inwe ajọ akọ na uche,+ jirikwa ya sachaa ahụ́ anyị.+