7 site n’ịghara iso mba ndị a na-akpakọrịta,+ bụ́ ndị a fọdụrụ n’etiti unu. Unu akpọtụkwala chi ha aha,+ unu ejikwala ha ṅụọ iyi,+ unu efekwala ha ofufe, unu akpọkwarala ha isiala.+
33 Ihe kpatara ya bụ na ha ahapụwo m+ ma malite ịkpọrọ Ashtọret+ bụ́ chi nwaanyị ndị Saịdọn isiala, tinyere Kimọsh+ bụ́ chi Moab na Milkọm+ bụ́ chi ụmụ Amọn; ha ejeghịkwa ije n’ụzọ m site n’ime ihe ziri ezi n’anya m na idebe ụkpụrụ m na mkpebi ikpe m dị ka Devid nna ya.
49Nke a bụ ihe Jehova kwuru banyere ụmụ Amọn:+ “Ọ̀ bụ na Izrel enweghị ụmụ, ka ọ̀ bụ na Izrel enweghị onye ga-eketa ihe ya? Gịnị mere Malkam+ ji weghara Gad,+ gịnịkwa mere ndị na-efe ya ji biri n’obodo ndị dị n’Izrel?”+