2 “Gwanụ Jeruselem okwu ga-eru ya n’obi.+ Tienụ mkpu gwa ya na oge ahụhụ ya agafewo,+ na a kwụchaala ụgwọ njehie ya.+ N’ihi na ọ natawo ụgwọ zuru ezu n’aka Jehova maka mmehie ya niile.”+
13 Ọ ga-erukwa na dị nnọọ ka unu bụ́ ụlọ Juda nakwa ụlọ Izrel+ ghọrọ ihe nkọcha n’etiti mba dị iche iche,+ otú ahụ ka m ga-azọpụta unu, unu ga-aghọkwa ngọzi.+ Unu atụla egwu.+ Meenụ ka aka unu dị ike.’+