21 “‘M ga-emekwa ka mma agha bịakwasị ya n’ógbè m niile bụ́ ugwu ugwu,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Mma agha onye nke ọ bụla ga-abịakwasị nwanne ya.+
2 Onye na-eguzosi ike n’ihe alawo n’iyi n’ụwa, ọ dịghịkwa onye ziri ezi n’etiti ụmụ mmadụ.+ Ha niile na-aga zoo iji wụfuo ọbara.+ Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.+
22 M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+
9 M wee sị: “Agaghị m anọgide na-azụ unu dị ka atụrụ.+ Nke na-anwụ anwụ, ya nwụọ. Nke a ga-ekpochapụ ekpochapụ, ka e kpochapụ ya.+ Ndị nke fọrọ afọ, ha rie anụ ibe ha.”+
13 “Ọ ga-erukwa n’ụbọchị ahụ na ọgba aghara nke si n’aka Jehova ga-adị ebe niile n’etiti ha;+ ha ga-ejidekwa ibe ha, onye ọ bụla ga-ejide aka ibe ya, ha ga-emegidekwa ibe ha.