8 Okporo ụzọ ga-adị n’ebe ahụ,+ ee, ụzọ ga-adị; a ga na-akpọ ya Ụzọ nke Ịdị Nsọ.+ Onye na-adịghị ọcha agaghị esi na ya gafee.+ Ọ ga-abụ maka onye na-eje ije n’ụzọ ahụ, ọ dịghịkwa ndị nzuzu ga-awagharị na ya.
9 “‘Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru: “Ọ dịghị onye mba ọzọ a na-ebighị úgwù n’obi, onye a na-ebighịkwa úgwù n’anụ ahụ́, nke ga-abata n’ebe nsọ m, ya bụ, onye mba ọzọ ọ bụla nọ n’etiti ụmụ Izrel.”’+
27 Ma ihe ọ bụla na-adịghị nsọ na onye ọ bụla nke na-eme ihe arụ,+ nke na-aghakwa ụgha,+ agaghị abanye n’ime ya ma ọlị;+ ọ bụ naanị ndị e dere aha ha n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ ga-abanye n’ime ya.+