17 Unu ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova bụ́ Chineke unu,+ onye bi na Zayọn bụ́ ugwu nsọ m.+ Jeruselem ga-aghọ ebe dị nsọ;+ ndị ala ọzọ agaghịkwa esi n’ime ya gafere ọzọ.+
21 Ite ọ bụla e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara, bụ́ nke dị na Jeruselem na Juda, ga-aghọ ihe dị nsọ nke Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị niile na-achụ àjà ga-abata were ha sie ihe.+ A gakwaghị enwe onye Kenan+ n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha n’ụbọchị ahụ.”+