9 N’ihi na anya+ Jehova na-ahụzu ụwa dum+ iji gosi ike ya maka ndị obi ha+ zuru ezu n’ebe ọ nọ. I zuzuru nzuzu+ n’ihe a i mere, n’ihi ya, malite ugbu a gaa n’ihu, a ga na-ebuso gị agha.”+
6 M wee hụ nwa atụrụ+ nke guzo n’etiti ocheeze ahụ+ na n’etiti ihe anọ ahụ dị ndụ na n’etiti ndị okenye ahụ+ dị ka à ga-asị na e gburu ya egbu,+ o nwere mpi asaa na anya asaa, bụ́ anya ndị pụtara mmụọ asaa+ nke Chineke, bụ́ ndị e zigara n’ụwa dum.