9 “Ma unu onwe unu, lezienụ anya; ndị mmadụ ga-akpụrụ unu gaa n’ụlọikpe obodo,+ a ga-etikwa unu ihe n’ụlọ nzukọ,+ a ga-emekwa ka unu guzoro n’ihu ndị gọvanọ na ndị eze n’ihi m, ka ọ bụrụ àmà nye ha.+
12 “Ma tupu ihe a niile emee, ndị mmadụ ga-ejide unu ma kpagbuo+ unu, kpụrụ unu gaa n’ụlọ nzukọ, tụbakwa unu n’ụlọ mkpọrọ, a ga-akpụgakwa unu n’ihu ndị eze na ndị gọvanọ n’ihi aha m.+
21 N’eziokwu, a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu,+ wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.+