10 Ma ụbọchị Jehova+ ga-abịa dị ka onye ohi,+ bụ́ mgbe eluigwe ga-eji oké ụzụ+ gabiga,+ ma ihe ndị dị n’eluigwe na ụwa ga-adị oké ọkụ wee gbazee,+ a ga-ekpughekwa ụwa+ na ọrụ ndị a rụrụ n’ime ya.+
3 Ya mere, na-echeta ihe ị natara+ na ihe ị nụrụ, na-edebekwa ya,+ ma chegharịa.+ N’ezie, ọ bụrụ na i tetaghị,+ m ga-abịa dị ka onye ohi,+ ị gaghịkwa ama oge awa m ga-abịakwasị gị.+