23 Ma Ahitofel hụrụ na e meghị ihe ọ dụrụ n’ọdụ,+ o wee dokwasị ihe o ji anọkwasị n’ịnyịnya ibu wee bilie laa n’ụlọ ya, n’obodo ya.+ O wee nye ezinụlọ ya iwu+ ma kwụgbuo+ onwe ya, o wee si otú a nwụọ.+ E wee lie+ ya n’ebe ili ozu nke nna nna ya hà.
18 (Ya mere, nwoke a ji ụgwọ ọrụ nke ajọ omume+ zụta+ otu ala, o bukwa ụzọ sụọ isi n’ala,+ afọ ya wee gbawaa mee mkpọtụ, eriri afọ ya niile wee wụpụta.