52 Ya mere, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụ otú ahụ, onye ọ bụla bụ́ onye na-ezi ihe n’ihu ọha, mgbe e ziri ya ihe banyere alaeze eluigwe,+ yiri nwoke bụ́ onyeisi ezinụlọ, onye na-esi n’ụlọ akụ̀ ya ewepụta ihe ndị dị ọhụrụ na ndị mere ochie.”+
45 Ezi mmadụ na-esi n’ezi akụ̀ nke obi ya ewepụta ihe ọma,+ ma ajọ mmadụ na-esi n’ajọ akụ̀ ya ewepụta ihe ọjọọ; n’ihi na ọ bụ ihe jupụtara ya n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+
6 Ire bụ ọkụ.+ N’ime ihe niile dị anyị n’ahụ́, ire jupụtara n’ajọ omume, n’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ dum nwee ntụpọ,+ ọ na-amụnyekwa usoro ndụ nke sitere n’okike ọkụ, Gehena* na-amụnyekwa ya ọkụ.