30 Hapụnụ ha abụọ ka ha tokọọ ruo n’oge owuwe ihe ubi; n’oge owuwe ihe ubi, m ga-agwa ndị na-ewe ihe ubi, sị, Burunụ ụzọ chịkọta ata ahụ ma kee ha n’ùkwù n’ùkwù ka e suo ha ọkụ,+ e mesia, unu agaa chịkọta ọka wit ahụ chịba n’ụlọ nkwakọba ihe m.’”+
8 Ma ndị ụjọ na ndị na-enweghị okwukwe+ na ndị rụrụ arụ n’ihi omume ha ruru unyi+ na ndị na-egbu ọchụ+ na ndị na-akwa iko+ na ndị na-eme mgbaasị na ndị na-ekpere arụsị+ na ndị ụgha niile,+ òkè ha ga-abụ n’ime ọdọ ahụ nke ji ọkụ+ na sọlfọ+ na-enwu. Nke a pụtara ọnwụ nke abụọ.”+