22 Ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn ga-eji ha na-abụ ọnụ, sị: “Ka Jehova mee ka ị dị ka Zedekaya na Ehab,+ bụ́ ndị eze Babịlọn gbara ọkụ!”+
17 Ọ bụrụ na a tụba anyị n’ime ya, Chineke anyị bụ́ onye anyị na-efe ofufe ga-anapụtali anyị. Ọ ga-anapụta anyị n’oké ọkụ ahụ a kwanyere, napụtakwa anyị n’aka gị, eze.+
15 E nyekwara ya ikike ikunye onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ume, ka onyinyo nke anụ ọhịa ahụ wee na-ekwu okwu ma na-eme ka e gbuo ndị niile na-agaghị efe onyinyo+ nke anụ ọhịa ahụ ofufe n’ụzọ ọ bụla.