1 Samuel 17:37 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 37 Devid kwukwara, sị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.”+ Sọl wee sị Devid: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”+ 2 Samuel 22:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dike, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+ Abụ Ọma 27:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Jehova bụ ìhè m+ na nzọpụta m.+Ònye ka m ga-atụ egwu?+Jehova bụ idé ji ndụ m.+Ònye ka m ga-atụ ụjọ?+ Ilu 18:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike.+ N’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, e wee chebe ya.+ Aịzaya 12:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Lee! Chineke bụ nzọpụta m.+ M ga-atụkwasị ya obi, m gaghịkwa atụ ụjọ;+ n’ihi na Jaa Jehova bụ ike m+ na ume m,+ o wee ghọọrọ m nzọpụta.”+ Daniel 6:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Ọ na-anapụta ma na-agbapụta ndị ya,+ na-eme ihe ịrịba ama na ihe ebube n’eluigwe+ na n’elu ụwa,+ n’ihi na ọ napụtawo Daniel n’aka ọdụm.” Maịka 7:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova.+ M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.+ Chineke m ga-anụ olu m.+ 2 Ndị Kọrịnt 1:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ọ napụtara anyị n’oké ihe dị otú ahụ nke bụ́ ọnwụ, ọ ga-anapụtakwa anyị;+ olileanya anyị dịkwa n’ebe ọ nọ na ọ ga-anapụta anyị ọzọ.+
37 Devid kwukwara, sị: “Jehova, bụ́ onye napụtara m n’aka ọdụm nakwa n’aka anụ ọhịa bea, ọ bụ ya ga-anapụta m n’aka onye Filistia nke a.”+ Sọl wee sị Devid: “Gawa, ka Jehova nọnyekwara gị.”+
26 Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe;+Ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dike, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ;+
27 Jehova bụ ìhè m+ na nzọpụta m.+Ònye ka m ga-atụ egwu?+Jehova bụ idé ji ndụ m.+Ònye ka m ga-atụ ụjọ?+
2 Lee! Chineke bụ nzọpụta m.+ M ga-atụkwasị ya obi, m gaghịkwa atụ ụjọ;+ n’ihi na Jaa Jehova bụ ike m+ na ume m,+ o wee ghọọrọ m nzọpụta.”+
27 Ọ na-anapụta ma na-agbapụta ndị ya,+ na-eme ihe ịrịba ama na ihe ebube n’eluigwe+ na n’elu ụwa,+ n’ihi na ọ napụtawo Daniel n’aka ọdụm.”
7 Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova.+ M ga-echere Chineke nke nzọpụta m.+ Chineke m ga-anụ olu m.+
10 Ọ napụtara anyị n’oké ihe dị otú ahụ nke bụ́ ọnwụ, ọ ga-anapụtakwa anyị;+ olileanya anyị dịkwa n’ebe ọ nọ na ọ ga-anapụta anyị ọzọ.+