18 Ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ nụkwara ya, ha wee malite ịchọ otú ha ga-esi gbuo ya;+ n’ihi na ha na-atụ ya egwu, n’ihi na otú o si ezi ihe nọ na-eju ìgwè mmadụ ahụ dum anya.+
19 Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà na-achọ ka ha jide ya n’oge awa ahụ, ma ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu; n’ihi na ha ghọtara na o bu ha n’obi mee ihe atụ ahụ.+