Luk
20 N’otu n’ime ụbọchị ndị ahụ, mgbe ọ nọ na-ezi ìgwè mmadụ ihe n’ụlọ nsọ ma na-ezisa ozi ọma, ndị isi nchụàjà na ndị odeakwụkwọ na ndị okenye bịaruru ya nso,+ 2 ha wee kwuo okwu n’olu dara ụda, sị ya: “Gwa anyị ikike i ji eme ihe ndị a, ma ọ bụ, ònye nyere gị ikike a.”+ 3 Ọ zara ha, sị: “Mụ onwe m ga-ajụkwa unu otu ajụjụ, unu gwakwa m:+ 4 Baptizim Jọn, ò si n’eluigwe ka ò si n’aka mmadụ?”+ 5 Ya mere, ha kwuru n’etiti onwe ha, sị: “Ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’eluigwe,’ ọ ga-asị, ‘Gịnị mere unu ekwereghị ya?’+ 6 Ma ọ bụrụ na anyị asị, ‘O si n’aka mmadụ,’ ndị a niile ga-atụ anyị nkume,+ n’ihi na ha kwetara na Jọn+ bụ onye amụma.”+ 7 Ya mere, ha zara na ha amaghị ebe o si. 8 Jizọs wee sị ha: “M gaghịkwa agwa unu ikike m ji na-eme ihe ndị a.”+
9 O wee malite imere ìgwè mmadụ ahụ ihe atụ, sị: “Otu nwoke kọrọ ubi vaịn+ ma nyefee ya n’aka ndị ọrụ ubi, o wee gaa mba ọzọ, nọtetụ aka.+ 10 Ma mgbe oge ya ruru, o zigaara ndị ọrụ ubi+ ahụ otu ohu,+ ka ha wee nye ya ụfọdụ n’ime mkpụrụ nke ubi vaịn+ ahụ. Otú ọ dị, ndị ọrụ ubi ahụ sịrị ya lawa, n’enyeghị ya ihe ọ bụla,+ mgbe ha tikasịchara ya ahụ́. 11 Ma o zigakwaara ha ohu ọzọ dị iche. Ha tikwara onye nke ahụ ihe ma menye ya ihere, sị ya lawa, n’enyeghị ya ihe ọ bụla.+ 12 N’agbanyeghị nke ahụ, o zigakwara onye nke atọ;+ ha merụkwara ya ahụ́ ma chụpụ ya. 13 Onye nwe ubi vaịn ahụ wee sị, ‘Gịnị ka m ga-eme? M ga-eziga ọkpara m nke m hụrụ n’anya.+ Ikekwe, ha ga-akwanyere onye nke a ùgwù.’ 14 Mgbe ndị ọrụ ubi ahụ hụrụ ya, ha gbaara ya izu, sị, ‘Onye a bụ onye ga-eketa ubi a; ka anyị gbuo ya, ka ihe nketa a wee ghọọ nke anyị.’+ 15 Ha wee kpọpụ+ ya n’ubi vaịn ahụ ma gbuo+ ya. Ya mere, gịnị ka onye nwe ubi vaịn ahụ ga-eme ha?+ 16 Ọ ga-abịa gbuo ndị ọrụ ubi a, ọ ga-enyefekwa ndị ọzọ ubi vaịn ahụ.”+
Mgbe ha nụrụ ihe a, ha sịrị: “Tụfịakwa!” 17 Ma o legidere ha anya wee sị: “Gịnịzi ka ihe a e dere pụtara, ‘Nkume ahụ nke ndị na-ewu ụlọ jụrụ,+ ọ bụ ya ghọrọ nkume isi nkuku bụ́ isi.+ 18 Onye ọ bụla nke dara n’elu nkume ahụ ga-akụri.+ Onye ọ bụla ọ dakwasịrị,+ ọ ga-egweri ya.”+
19 Ndị odeakwụkwọ na ndị isi nchụàjà na-achọ ka ha jide ya n’oge awa ahụ, ma ha tụrụ ìgwè mmadụ ahụ egwu; n’ihi na ha ghọtara na o bu ha n’obi mee ihe atụ ahụ.+ 20 Mgbe ha leruru ya anya, ha zipụrụ ndị mmadụ na nzuzo bụ́ ndị e goro ego ime ka hà bụ ndị ezi omume, ka ha wee jide ya n’okwu ọnụ ya,+ ka ha wee nyefee ya n’aka ndị ọchịchị nakwa n’aka gọvanọ.*+ 21 Ha wee jụọ ya, sị: “Onye Ozizi, anyị maara na ị na-ekwu okwu ma na-ezi ihe n’ụzọ ziri ezi, ị dịghịkwa ele mmadụ anya n’ihu, kama ị na-ezi ụzọ Chineke n’eziokwu:+ 22 Iwu ọ̀ kwadoro ka anyị na-akwụ Siza ụtụ isi ka ọ̀ bụ na ọ kwadoghị ya?”+ 23 Ma ọ chọpụtara aghụghọ ha wee sị ha:+ 24 “Gosinụ m otu mkpụrụ ego dinarịọs. Ọ̀ bụ onyinyo onye na aha onye dị ya? Ha wee sị: “Ọ bụ nke Siza.”+ 25 O wee sị ha: “Ya mere, hụnụ na unu kwụrụ Siza ihe Siza,+ ma kwụọnụ Chineke ihe Chineke.”+ 26 Otú ọ dị, ha enweghị ike ijide ya n’okwu a n’ihu ìgwè mmadụ ahụ, kama, ebe azịza ya juru ha anya, ha ekwughị ihe ọ bụla.+
27 Otú ọ dị, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite n’ọnwụ adịghị, bịara+ wee jụọ ya ajụjụ, 28 sị: “Onye Ozizi, Mozis+ deere anyị akwụkwọ, sị, ‘Ọ bụrụ na nwanne mmadụ bụ́ onye nwere nwunye anwụọ, ma ọ dịghị nwa onye a mụtara, nwanne ya nwoke+ kwesịrị ịkpọrọ nwunye ya wee site n’aka ya mụtara nwanne ya nwoke nwa.’+ 29 Ya mere, e nwere ụmụnne asaa; nke mbụ wee lụọ nwunye ma nwụọ n’amụtaghị nwa.+ 30 Otú ahụ ka nke abụọ mekwara, 31 nke atọ wee lụwa ya. Otú ahụ ka ha asaa mekwara: ha niile nwụchara n’amụtaghị nwa.+ 32 N’ikpeazụ, nwaanyị ahụ nwụkwara.+ 33 Ya mere, ná mbilite n’ọnwụ, ònye n’ime ha ka ọ ga-aghọ nwunye ya? Ebe ọ bụ na mmadụ asaa ahụ lụrụ ya.”+
34 Jizọs sịrị ha: “Ụmụ nke usoro ihe a na-alụ nwunye,+ a na-ekekwa ha di, 35 ma ndị a gụrụ ná ndị ruru eru+ inweta usoro ihe na-abịanụ+ na inweta mbilite n’ọnwụ+ adịghị alụ nwunye, a dịghịkwa eke ha di. 36 N’eziokwu, ha apụghịkwa ịnwụ anwụ+ ọzọ, n’ihi na ha dị ka ndị mmụọ ozi, ha bụkwa ụmụ Chineke site n’ịbụ ụmụ nke mbilite n’ọnwụ.+ 37 Ma ọbụna Mozis mere ka a mara na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, n’ihe e dere banyere osisi ogwu+ ahụ, mgbe ọ kpọrọ Jehova ‘Chineke Ebreham na Chineke Aịzik na Chineke Jekọb.’+ 38 Ọ bụghị Chineke nke ndị nwụrụ anwụ, kama nke ndị dị ndụ, n’ihi na n’ebe ọ nọ, ha niile dị ndụ.”+ 39 Ụfọdụ n’ime ndị odeakwụkwọ ahụ zara ya, sị: “Onye Ozizi, i kwutere ya.” 40 N’ihi na ha enwekwaghị obi ike ịjụ ya ajụjụ ọ bụla.
41 O wee sị ha: “Olee otú o si bụrụ na a na-ekwu na Kraịst bụ nwa Devid?+ 42 N’ihi na Devid kwuru n’akwụkwọ Abụ Ọma, sị, ‘Jehova gwara Onyenwe m, “Nọdụ ala n’aka nri m 43 ruo mgbe m debere ndị iro gị ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ gị.”’+ 44 Ya mere, Devid kpọrọ ya ‘Onyenwe m’; oleezi otú o si bụrụ nwa ya?”
45 Ya mere, ka ndị ahụ niile nọ na-ege ntị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị:+ 46 “Lezienụ anya maka ndị odeakwụkwọ bụ́ ndị ọ na-amasị iyi uwe mwụda na-ejegharị, ọ na-atọkwa ha ụtọ ka a na-ekele ha n’ọma ahịa, ka ha na-anọkwa n’oche ihu n’ụlọ nzukọ na ebe ndị kasị ùgwù ná nri anyasị,+ 47 ndị na-eripịakwa ụlọ ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ,+ na-ekpekwa ogologo ekpere iji megharịa ndị mmadụ anya. A ga-ama ha ikpe ka ukwuu.”+