13Ma, ebe Jizọs maara tupu ememme ngabiga ahụ na oge awa ya eruwo+ ka ọ pụọ n’ụwa lakwuru Nna ya,+ ọ hụrụ ndị nke ya nọ n’ụwa n’anya,+ ọ hụrụ ha n’anya ruo ọgwụgwụ.
7 Wepụnụ ihe iko achịcha ochie ahụ, ka unu wee bụrụ ntụ ọka ọhụrụ a gwakọtara agwakọta,+ dị ka unu bụ ihe na-ekoghị eko. N’ihi na, n’ezie, a chụwo+ nwa atụrụ ememme ngabiga+ anyị n’àjà, ya bụ, Kraịst.+