Matiu 26:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 Otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, onye a na-akpọ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà Mak 14:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Judas Iskarịọt, otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, wee gakwuru ndị isi nchụàjà ka o wee rara ya nye n’aka ha.+ Jọn 6:70 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 70 Jizọs wee zaa ha, sị: “M họọrọ unu mmadụ iri na abụọ,+ ọ́ bụghị ya? Ma otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.”+ Jọn 13:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ya mere, mgbe ha nọ na-eri nri anyasị ahụ, mgbe Ekwensu tinyeworo ya n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ịrara ya nye,+ Jọn 13:27 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 27 Mgbe o nyesịrị ya achịcha ahụ, Setan banyere n’ime Judas.+ Ya mere, Jizọs sịrị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.” Ọrụ Ndịozi 1:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 n’ihi na ọ bụbu onye òtù anyị,+ o ketakwara òkè n’ije ozi a.+
10 Judas Iskarịọt, otu n’ime mmadụ iri na abụọ ahụ, wee gakwuru ndị isi nchụàjà ka o wee rara ya nye n’aka ha.+
70 Jizọs wee zaa ha, sị: “M họọrọ unu mmadụ iri na abụọ,+ ọ́ bụghị ya? Ma otu onye n’ime unu bụ onye nkwutọ.”+
2 Ya mere, mgbe ha nọ na-eri nri anyasị ahụ, mgbe Ekwensu tinyeworo ya n’obi Judas Iskarịọt,+ nwa Saịmọn, ịrara ya nye,+
27 Mgbe o nyesịrị ya achịcha ahụ, Setan banyere n’ime Judas.+ Ya mere, Jizọs sịrị ya: “Ihe ị na-eme, mee ya ọsọ ọsọ.”