27 “‘E nyere ndị nsọ nke Onye Kasị Elu alaeze na ọchịchị na ebube nke alaeze ndị dị n’okpuru eluigwe dum.+ Alaeze ha bụ alaeze na-adịru mgbe ebighị ebi,+ ọchịchị niile ga-ejekwara ha ozi ma rubere ha isi.’+
28 Ya mere, ebe anyị ga-enweta alaeze nke a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji,+ ka anyị na-enweta obiọma na-erughịrị mmadụ, nke anyị ga-esite na ya jiri egwu Chineke na ụjọ+ na-ejere Chineke ozi dị nsọ nke ọ na-anabata.
5 Geenụ ntị, ụmụnna m m hụrụ n’anya. Ọ̀ bụ na Chineke ahọrọghị ndị dara ogbenye+ n’ihe nke ụwa ka ha bụrụ ndị bara ọgaranya+ n’okwukwe, bụrụkwa ndị nketa nke alaeze ahụ, nke o kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya?+