57 na-elekwa ọbụna ichi nwa nke si n’agbata ụkwụ ya pụta na ụmụ ya ndị ikom bụ́ ndị ọ mụrụ,+ n’ihi na ọ ga-eri ha na nzuzo n’ihi ịnọ n’ụkọ ihe niile n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị n’obodo gị ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu.+
19 N’ihi na ọ bụ ákwá arịrị ka a nụrụ site na Zayọn, sị:+ “Lee otú e si bukọrọ ihe anyị nwere!+ Lee otú ihere si mee anyị! N’ihi na anyị ahapụwo ala anyị; n’ihi na ha akụtuwo ebe obibi anyị.”+
44 Ha ga-akụtu gị na ụmụ gị bụ́ ndị nọ n’ime gị n’ala,+ ha agaghịkwa ahapụ otu nkume n’elu nkume ibe ya+ n’ime gị, n’ihi na ị ghọtaghị oge e ji eleta gị.”+