29 Matanụ na Jehova enyewo unu ụbọchị izu ike.+ Ọ bụ ya mere o ji na-enye unu ihe oriri unu ga-eri ụbọchị abụọ n’ụbọchị nke isii. Onye ọ bụla nọrọ n’ụlọ ya.+ Ka onye ọ bụla ghara isi n’ebe o bi pụọ n’ụbọchị nke asaa.”
15 Ụbọchị isii ka e nwere ike ịrụ ọrụ, ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike, nke a ga-ezu naanị ike na ya.+ Ọ bụ ihe dị nsọ nye Jehova. Onye ọ bụla rụrụ ọrụ n’ụbọchị izu ike, a ghaghị igbu ya.