23 O wee gwa ha, sị: “Ọ bụ ihe Jehova kwuru. Echi, a ga-edebe ụbọchị izu ike bụ́ ụbọchị izu ike dị nsọ a na-edebere Jehova.+ Gheenụ nke unu nwere ike ighe, siekwanụ nke unu nwere ike isi,+ debekwaranụ onwe unu nke ọ bụla fọrọ, dị ka ihe unu ga-edebe ruo ụtụtụ.”