37 “Ugbu a, mụ onwe m, Nebukadneza, na-eto ma na-ebuli Eze eluigwe elu, na-ajakwa ya mma,+ n’ihi na ọrụ ya niile bụ eziokwu, ụzọ ya niile bụkwa ikpe ziri ezi,+ nakwa n’ihi na o nwere ike iweda ndị ji mpako na-eje ije ala.”+
5 Otú ahụkwa, unu ụmụ okorobịa, na-edonụ onwe unu n’okpuru+ ndị okenye. Ma unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu,+ n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.+