9 Ṅụrịa ọṅụ,+ nwa okorobịa, mgbe ị bụ okorobịa, ka obi na-atọkwa gị ụtọ n’oge ị bụ okorobịa, jeekwa ije dị ka ihe dị gị n’obi si dị nakwa dị ka ihe anya gị na-ahụ si dị.+ Kama mara na ezi Chineke ga-ekpe gị ikpe+ n’ihi ihe ndị a niile.
19 “Ma otu nwoke+ bara ọgaranya. Ọ na-ejikwa ákwà na-acha odo odo na ákwà linin achọ onwe ya mma, na-emekwa onwe ya obi ụtọ n’ụzọ okomoko site n’ụbọchị ruo n’ụbọchị.+
5 Unu ebiwo ndụ okomoko n’elu ụwa, unu ebiwokwa ndụ dị ka ihe ụtọ nke anụ ahụ́ si dị.+ Unu emewo ka obi unu dị ka anụ mara abụba ruo n’ụbọchị a ga-egbu ha.+