5 Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, lee! ígwé ojii na-enwu gbaa kpuchiri ha, lee! otu olu si n’ígwé ojii ahụ, sị: “Onye a bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya, onye ihe ya masịrị m;+ geenụ ya ntị.”+
9 Ọ bụrụ na anyị na-anabata àmà ndị mmadụ na-agba,+ àmà nke Chineke na-agba ka ukwuu, n’ihi na ihe a bụ àmà Chineke na-agba, ya bụ, àmà+ ọ gbara banyere Ọkpara ya.