43 Otú ọ dị, onye na-ejere ya ozi sịrị: “Olee otú m ga-esi bute ihe a n’ihu otu narị ndị ikom?”+ O wee zaa, sị: “Nye ya ndị a ka ha rie, n’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru, ‘A ga-eri ihe oriri, a ga-enwekwa ihe a ga-erifọ.’”+
19 O wee nye ìgwè mmadụ ahụ iwu ka ha nọdụ ala n’ahịhịa, o wee were ogbe achịcha ise na azụ̀ abụọ ahụ. O leliri anya n’eluigwe wee gọzie ha.+ Mgbe ọ nyawasịrị achịcha ndị ahụ, o kesaara ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.+
14 N’eziokwu, ha dị ihe dị ka puku ndị ikom ise.+ Ma ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Meenụ ka ha nọdụ ala dị ka e si anọ na-eri nri, n’ìgwè n’ìgwè, ihe dị ka mmadụ iri ise mmadụ iri ise.”+