18 “Mmụọ Jehova+ dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa,+
22 Otú ọ dị, ebe e mere ka unu si ná mmehie pụọ nwere onwe unu ugbu a, ma ghọọ ndị ohu Chineke,+ mkpụrụ+ unu na-enweta bụ ịdị nsọ, ọ ga-edugakwa ná ndụ ebighị ebi.+
25 Ma onye na-enyocha iwu ahụ zuru okè+ nke na-eweta nnwere onwe, onye nọgidekwara n’ime ya, ga-enwe obi ụtọ+ n’ime ya eme, n’ihi na ọ bụghị onye na-echefu ihe ọ nụrụ, kama ọ bụ onye na-arụ ọrụ ahụ.+