21 ka ha niile wee bụrụ otu,+ dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu, mụ onwe m na gị adịrịkwa n’otu,+ ka anyị na ha wee dị n’otu,+ ka ụwa wee kwere na ọ bụ gị zitere m.+
28 E nweghịkwa onye Juu ma ọ bụ onye Grik,+ e nweghịkwa ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya,+ e nweghịkwa nwoke ma ọ bụ nwaanyị;+ n’ihi na unu niile bụ otu onye n’ime Kraịst Jizọs.+
6 ya bụ, na ndị mba ọzọ kwesịrị ịbụ ndị anyị na ha na-eketakọ ihe na ndị so bụrụ akụkụ nke ahụ́+ ahụ na ndị so anyị na-eketa nkwa+ ahụ n’ịdị n’otu nke anyị na Kraịst Jizọs site n’ozi ọma ahụ.