Ndị Efesọs
2 Ọ bụkwa unu ka Chineke mere ka unu dị ndụ, ọ bụ ezie na unu nwụrụ anwụ ná njehie unu na mmehie unu,+ 2 nke unu jere ije na ha n’otu mgbe dị ka usoro+ ihe nke ụwa a si dị, dị ka onye na-achị+ ikike nke ikuku si chọọ, bụ́ mmụọ+ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.+ 3 Ee, n’oge gara aga, anyị niile mere omume n’etiti ha dị ka ọchịchọ anụ ahụ́ anyị si dị,+ na-eme ihe anụ ahụ́+ anyị na echiche anyị chọrọ, anyị bụkwa ụmụ ọnụma+ site n’ọmụmụ ọbụna dị ka ndị ọzọ. 4 Ma Chineke, onye ebere ya dị ukwuu,+ n’ihi oké ịhụnanya ya nke o nwere n’ebe anyị nọ,+ 5 mere ka anyị na Kraịst dịkọọ ndụ, ọbụna mgbe anyị nwụrụ anwụ ná njehie+—e sitewo n’obiọma na-erughịrị mmadụ zọpụta unu+— 6 ọ kpọlitekọkwara anyị+ na ya ma nyekọọ anyị na ya oche n’ebe ndị dị n’eluigwe+ n’ihi na anyị na Kraịst Jizọs dị n’otu, 7 ka e wee gosipụta, n’ime usoro ihe ndị na-abịanụ,+ oké+ obiọma ya nke na-erughịrị mmadụ site n’amara ya n’ebe anyị nọ n’ịdị n’otu+ nke anyị na Kraịst Jizọs.
8 N’ezie, site n’obiọma a na-erughịrị mmadụ, a zọpụtawo unu site n’okwukwe;+ nke a esighịkwa unu n’aka,+ ọ bụ onyinye Chineke.+ 9 Ee e, o siteghị n’ọrụ,+ ka mmadụ ọ bụla wee ghara inwe ihe ọ ga-eji na-anya isi.+ 10 N’ihi na anyị bụ aka ọrụ ya,+ e kekwara+ anyị site n’ịdị n’otu+ nke anyị na Kraịst Jizọs maka ọrụ ọma,+ nke Chineke kwadebere tupu oge eruo+ ka anyị wee na-eje ije n’ime ha.
11 Ya mere, burunụ n’uche na n’oge gara aga unu bụ ndị mba ọzọ n’anụ ahụ́;+ ndị e ji aka “bie úgwù” n’anụ ahụ́ na-akpọ unu ndị “a na-ebighị úgwù”+— 12 na unu enweghị Kraịst+ n’oge ahụ, bụrụ ndị e kewapụrụ+ ná mba Izrel na ndị mba ọzọ n’ebe ọgbụgba ndụ nke nkwa+ ahụ dị, unu enweghịkwa olileanya,+ unu bụkwa ndị na-enweghị Chineke n’ụwa.+ 13 Ma ugbu a, n’ịdị n’otu nke unu na Kraịst Jizọs, unu ndị nọbu n’ebe dị anya abịawo nọrọ nso site n’ọbara+ Kraịst. 14 N’ihi na ya onwe ya bụ udo anyị,+ ya bụ, onye ahụ nke mere ka ìgwè abụọ+ ahụ bụrụ otu+ ma bibie mgbidi+ dị n’etiti nke kewapụrụ ha.+ 15 Site n’anụ ahụ́ ya,+ o wepụrụ ihe ahụ na-akpata ibu iro,+ ya bụ, Iwu ahụ nke ihe mejupụtara ya bụ ntụziaka na ụkpụrụ,+ ka o wee kee ìgwè abụọ+ ahụ ka ya na ha wee dịrị n’otu, ka ha wee ghọọ otu onye dị ọhụrụ+ wee mee ka udo dị; 16 ka o wee meekwa ka ndị abụọ ahụ dị ná mma n’ụzọ zuru ezu+ n’otu ahụ́+ nye Chineke site n’osisi ịta ahụhụ,+ n’ihi na o jiriwo onwe ya mee ka ibu iro+ ahụ ghakwara ịdị. 17 Ọ bịakwara wee zisaara unu ozi ọma nke udo,+ unu ndị nọ n’ebe dị anya, zisakwaara ndị nọ nso ozi ọma nke udo,+ 18 n’ihi na ọ bụ site n’aka ya ka anyị onwe anyị, bụ́ ìgwè abụọ ahụ,+ nwere ike ịbịaru+ Nna ahụ nso site n’otu mmụọ.+
19 Ya mere, unu abụkwaghị ndị mba ọzọ+ na ndị mbịarambịa,+ kama unu na ndị nsọ+ bụ ụmụ amaala,+ unu sokwa n’ezinụlọ+ Chineke, 20 e wukwasịkwara unu n’elu ntọala+ nke bụ́ ndịozi+ na ndị amụma,+ ebe Kraịst Jizọs n’onwe ya bụ nkume isi nkuku e ji tọọ ntọala.+ 21 N’ịdị n’otu nke ya na ya, ụlọ ahụ dum, ebe ọ bụ nke e jikọrọ akụkụ ya niile ọnụ,+ na-eto eto ka ọ ghọọrọ Jehova ụlọ nsọ.+ 22 N’ịdị n’otu nke unu na ya,+ a na-ewulikọkwa unu elu ka unu ghọọ ebe Chineke ga-ebi site na mmụọ ya.+