5 m ga-enye ha ihe ncheta+ na aha,+ ihe ka ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom mma,+ n’ụlọ m+ nakwa n’ime ogige m. M ga-enye ha aha ga-adịru mgbe ebighị ebi,+ nke a na-agaghị ebipụ ebipụ.+
15 ma ọ bụrụ na mụ abịaghị ngwa ngwa, ka i wee mara otú i kwesịrị isi na-eme omume n’ezinụlọ nke Chineke,+ nke bụ́ ọgbakọ nke Chineke dị ndụ, ogidi na ihe nkwado+ nke eziokwu.
6 Ma Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara+ nke na-elekọta ụlọ Onye ahụ.+ Anyị bụ ụlọ Onye ahụ, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie nkwuwa okwu anyị ike, na ịnya isi anyị n’ihi olileanya ahụ, ruo ọgwụgwụ.+