2 na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya,+ dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya+ ma nyefee onwe ya maka unu dị ka onyinye+ na àjà, ka ọ bụrụ ihe na-esi ísì ụtọ+ nye Chineke.
16 Anyị si otú a mara ihe bụ́ ịhụnanya,+ n’ihi na onye ahụ tọgbọrọ mkpụrụ obi ya n’ihi anyị;+ anyị jikwa ụgwọ ịtọgbọ mkpụrụ obi anyị n’ihi ụmụnna anyị.+