9 N’ihi na ha onwe ha na-akọ akụkọ banyere otú anyị si bata n’etiti unu na mbụ, na otú unu si hapụ arụsị+ unu wee bịakwute Chineke ka unu wee bụrụ ohu ezi+ Chineke dị ndụ,+
20 Ma anyị maara na Ọkpara Chineke abịawo,+ o nyewokwa anyị ikike inwe nghọta+ ka anyị wee mara ezi onye ahụ.+ Anyị na ezi onye ahụ dịkwa n’otu,+ site n’aka Ọkpara ya bụ́ Jizọs Kraịst. Onye a bụ ezi+ Chineke ahụ na ndụ ebighị ebi.+