17 Mgbe Devid hụrụ mmụọ ozi ahụ nọ na-egbu ndị mmadụ, ọ sịrị Jehova, ee, ọ sịrị: “Lee, ọ bụ m mehiere, ọ bụkwa m mere ihe ọjọọ; ma atụrụ+ ndị a—gịnị ka ha mere? Biko, ka aka gị bịakwasị m,+ bịakwasịkwa ụlọ nna m.”
21 Jehova wee ziga otu mmụọ ozi+ wee kpochapụ ndị dimkpa bụ́ dike+ na ndị ndú na ndị isi niile n’ebe eze Asiria mara ụlọikwuu,+ nke mere na o ji ihere laghachi n’ala ya. E mesịa, ọ banyere n’ụlọ chi ya, ụfọdụ n’ime ụmụ ya wee were mma agha gbuo ya n’ebe ahụ.+