1 Ndị Eze 22:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 O wee sị: “N’ezie, m na-ahụ ka a chụsasịrị+ ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova wee sị: ‘Ọ dịghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”+ Abụ Ọma 44:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Ị na-agbahapụ anyị dị ka atụrụ, dị ka anụ oriri,+Ị chụsawokwa anyị n’etiti mba niile.+ Abụ Ọma 95:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 N’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya, bụrụkwa atụrụ ndị aka ya na-elekọta.+Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+
17 O wee sị: “N’ezie, m na-ahụ ka a chụsasịrị+ ndị Izrel niile n’ugwu, dị ka atụrụ na-enweghị onye na-azụ ha.+ Jehova wee sị: ‘Ọ dịghị ndị nwe ndị a. Ka onye ọ bụla n’ime ha laghachi n’ụlọ ya n’udo.’”+
7 N’ihi na ya onwe ya bụ Chineke anyị, anyị bụ ndị ọ na-azụ n’ebe ịta nri ya, bụrụkwa atụrụ ndị aka ya na-elekọta.+Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya,+