2 N’ihi na terafim+ ekwuwo okwu anwansi; ndị na-agba afa ahụwo ọhụụ ụgha,+ ọ bụ nrọ na-abaghị uru ka ha na-akọ, ọ bụkwa n’efu ka ha na-agbalị inye nkasi obi.+ Ọ bụ ya mere ha ga-eji nukọrọ pụọ dị ka ìgwè atụrụ;+ ha ga-enwe mmekpa ahụ́, n’ihi na e nweghị onye ọzụzụ atụrụ.+
7 “Mma agha, teta bịakwasị onye ọzụzụ atụrụ m,+ bịakwasị ọbụna nwoke gbasiri ike nke bụ́ enyi m,”+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. “Gbuo onye ọzụzụ atụrụ,+ ka ìgwè atụrụ ya wee gbasasịa;+ m ga-eme ka aka m dịnyere ndị na-abaghị n’ihe.”+