7 Ihe isi ike dakwasịrị ya,+ o kwekwara ka e mekpaa ya ahụ́;+ ma o mepeghị ọnụ ya. A kpụụrụ ya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu;+ dịkwa ka nne atụrụ nke dara ogbi n’ihu ndị na-akpacha ya ajị, otú ahụkwa ka ọ na-emepeghị ọnụ ya.+
12 M wee sị ha: “Ọ bụrụ na ọ dị unu mma,+ kwụọnụ m ụgwọ ọrụ m; ma ọ bụrụ na ọ dịghị unu mma, unu hapụwa.” Ha wee kwụọ m ụgwọ ọrụ m, mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+