3 Ndị mmadụ ledara ya anya, zerekwa ya,+ ọ bụ onye nwere ihe mgbu, onye makwaara ihe bụ́ ọrịa.+ Ọ bụkwa onye anyị wepụrụ ihu anyị n’ebe ọ nọ.+ E ledara ya anya, ọ dịghịkwa ihe anyị ji ya kpọrọ.+
5 Ma a mara ya ube+ n’ihi mmebi iwu anyị;+ a nọkwa na-echi ya ọnụ n’ala n’ihi njehie anyị.+ A pịara ya ụtarị nke ga-eme ka anyị nwee udo,+ a gwọrọ anyị+ n’ihi ọnyá ya.+