12 Ọ bụrụ na ị sị: “Lee! Anyị amaghị banyere ihe a,”+ ọ̀ bụ na onye na-enyocha obi agaghị achọpụta,+ onye na-elegide mkpụrụ obi gị anya ọ́ gaghị amata+ wee kwụọ mmadụ ụgwọ dị ka ọrụ ya si dị?+
30 “‘Ya mere, ọ bụ dị ka ụzọ onye ọ bụla si dị ka m ga-ekpe unu ikpe,+ ụlọ Izrel,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.+ ‘Chigharịanụ, ee, hapụnụ mmebi iwu unu niile,+ ka ihe ọ bụla gharakwa ịbụrụ unu ihe ịsụ ngọngọ nke na-akpata njehie.+
27 N’ihi na a kawo ya aka na Nwa nke mmadụ ga-abịa n’ebube nke Nna ya, ya na ndị mmụọ ozi ya, mgbe ahụkwa, ọ ga-akwụ onye ọ bụla ụgwọ dị ka omume ya si dị.+