1 Samuel 16:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya,+ n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ,+ n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ;+ ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+ Ilu 5:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 N’ihi na ụzọ mmadụ dị n’ihu Jehova,+ ọ na-echebara ụzọ ya niile echiche.+ Ilu 17:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha, ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo,+ ma, ọ bụ Jehova na-enyocha obi.+ Ilu 21:2 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 2 Ụzọ niile nke mmadụ ziri ezi n’anya ya,+ ma Jehova na-enyocha obi.+
7 Ma Jehova sịrị Samuel: “Elela anya n’ọdịdị ya na ogo ya,+ n’ihi na ajụwo m ya. N’ihi na ọ bụghị otú mmadụ si ahụ ihe ka Chineke si ahụ,+ n’ihi na mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ;+ ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”+