Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi nke Jedutọn. Abụ olu ụtọ Devid.
62 N’ezie, ọ bụ Chineke ka mkpụrụ obi m gbara nkịtị na-echere.+
Nzọpụta m na-esi n’aka ya.+
2 N’ezie, ọ bụ oké nkume m na nzọpụta m, ebe m dị elu e wusiri ike;+
A gaghị eme ka m maa jijiji nke ukwuu.+
3 Ruo ole mgbe ka unu ga na-awakpo onye unu ga-egbu?+
Unu niile yiri mgbidi chọrọ ịda ada, mgbidi e ji nkume wuo nke a na-akwa aka ka ọ daa.+
4 N’ezie, ha na-enye mmadụ ndụmọdụ iji rafuo ya ka ọ ghara inwekwa ùgwù;+
Okwu ụgha na-atọ ha ụtọ.+
Ha na-eji ọnụ agọzi mmadụ, ma na-akọcha ya n’ime obi ha.+ Sila.
8 Tụkwasịnụ ya obi mgbe niile.+
Wụpụnụ obi unu n’ihu ya dị ka mmiri.+
Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.+ Sila.
9 Ụmụ mmadụ bụ n’ezie ume e kupụrụ ekupụ,+
Ụmụ mmadụ bụ ebe mgbaba a na-apụghị ịtụkwasị obi.+
Ọ bụrụ na a tụọ ha atụ̀, ha niile dị fere fere karịa ume e kupụrụ ekupụ.+