Mak 10:39 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 39 Ha wee sị ya: “Anyị pụrụ ịṅụ ya.” Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: “Unu ga-aṅụ iko ahụ m na-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim ahụ a na-eme m.+ 2 Ndị Kọrịnt 4:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’ebe niile, anyị na-edi mgbe niile n’ahụ́ anyị mmeso na-eweta ọnwụ nke e mesoro Jizọs,+ ka e wee mee ka ndụ Jizọs pụtakwa ìhè n’ahụ́ anyị.+ Ndị Kọlọsi 2:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 n’ihi na e likọrọ unu na ya na baptizim ya,+ sitekwa ná mmekọrịta unu na ya, a kpọlitekọkwara+ unu na ya site n’okwukwe+ unu nwere n’ịrụ ọrụ+ nke Chineke, onye mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+
39 Ha wee sị ya: “Anyị pụrụ ịṅụ ya.” Mgbe ahụ, Jizọs sịrị ha: “Unu ga-aṅụ iko ahụ m na-aṅụ, a ga-emekwa unu baptizim ahụ a na-eme m.+
10 N’ebe niile, anyị na-edi mgbe niile n’ahụ́ anyị mmeso na-eweta ọnwụ nke e mesoro Jizọs,+ ka e wee mee ka ndụ Jizọs pụtakwa ìhè n’ahụ́ anyị.+
12 n’ihi na e likọrọ unu na ya na baptizim ya,+ sitekwa ná mmekọrịta unu na ya, a kpọlitekọkwara+ unu na ya site n’okwukwe+ unu nwere n’ịrụ ọrụ+ nke Chineke, onye mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie.+