2 Ekwuwo m na mbụ, dịkwa ka à ga-asị na m nọ ya na nke ugboro abụọ, ọ bụ ezie na anọghị m ya ugbu a, tupu mụ abịa, ana m agwa ndị mere mmehie na mbụ na ndị ọzọ niile, na ọ bụrụ na mụ emechaa bịa ọzọ, agaghị m eme ebere,+
10 Ọ bụ ya mere m ji ede ihe ndị a mgbe m na-anọghị ya, ka ọ ga-abụ, mgbe m ga-anọ ya, ka m ghara ime omume n’aka ike+ dị ka ikike ahụ nke Onyenwe anyị nyere m si dị, iwuli elu,+ ọ bụghịkwa itida etida.